MAKA NDORONDORO OCHICHI NKE AFÖ 2019: NDI OKIGWE OGE ERUOLA!
Ndi Okigwe, ndi nwem na ndim nwe, ndewo nu ooo. Asim ya diri onye obula n'ime anyi nma; ma n'ututu, ma n'ehihie, ma n'abali. Oga adiri anyi niile nma; ma na Eke, Orie, Afö na Nkwo.
Bikonu, oge eruola ozo mgbe ana ahoputa onye nnochite anya ndi Okigwe n'ulo nzuko ome iwu nke di na Owerri ana akpo Imo State House of Assembly. Unu lee anya ugbua, unu ga ahu si otutu madu aputala. Onye obula n'asi; Zigam! Zigam!!
Bikonu ndi nwem, unu amarala si Ngwere niile makpucha amakpu, ya mere anyi amaghikwa nke afö na ahi (ma obu nke afö na aru). Kama site na ezigbo amamihe Chineke kere uwa ji gozie ndi Okigwe, anyi bu ndi nwere ezigbo ako na uche. N'ihi nke ahu, anyi ga eji anya ndi okemadu n'eji ahu öka Kara aka, were wedaa anya n'ala ma hoputa onye tozuru oke ma marakwa ihe ekwe n'ekwu.
Unu lee anya gburugburu Okigwe, unu g'ahu na anyi enweghi ezigbo uzö; anyi enweghi mmiri di ocha; anyi enweghi ökü latrik na otutu ebe ndi di iche iche; umu okorobia na agbogho ndi gucharala akwukwo na Mahadum dicha iche iche enweghi ihe ha g'aru; ahu ike buzi maka ndi ogaranya naani, kachakwa nke ndi nwere ike igaru ebe ökü n'enwo n'elu.
Oleekwanu ihe anyi ga ekwu maka ülö akwukwo na agum akwukwo na ala Okigwe?
Anyi enweghi ezigbo ülö akwukwo obula enwere ike iji mee önü. Ülö akwukwo anyi niile bucha nkpönkpö ebe, ebe ndi kacha nma iji zuo naani okuko, ewu, m'obu ezi. Olee ihe ojoo anyi mere n'ala Imo State?
Dika odi ugbua, odikwa ka olu ahu dara n'akwukwo si; "Onye ka anyi ga eziga, onye ga agara anyi?".
Ugbua anam asi unu; "Lekwanum ziga!".
Agam eje ozia n'eziokwu, na amamihe, na ezi nghota puru iche, na n'egwu Chineke.
Akwadorom akwado, dikwa na njikere ijere ndi Okigwe ozia n'eziokwu.
Ebe ndi puru iche mu onwem na ele anya bu ebe ndia;
1. Agum akwukwo (EDUCATION)
2. Ahu ike (HEALTH)
3. Oru ubi na izu anü di iche iche (AGRICULTURE)
4. Ikpü üzü uwa ohuu nke ana akpö "Technology" na aka örü di iche ichie (TECHNOLOGY)
5. Nakwa idu ahia n'uzo puru iche (EMPOWERMENT)
Ebe ndia ga eme ka otutu ihe oma gbasaa na obodo Okigwe niile. Ha ga emetucha aka na ichekwa obodo *(security*), omumu nwa *(infant and maternal mortality rate*), ezi ndu, obi uto, egwuregwu *(Sports*), ome n'ala *(promotion of Culture and Tradition through Tourism*), na nmepe obodo *(developments*) n'uzo puru iche.
Onwere onye ihe oma na anaghi adi nma umunnem na umunnam?
Bikonu bianu tinye aka k'anyi mee ka ala Okigwe di nma.Okigwe nwere ike idi nma karia mba ndi özö ana anü aha ha anü.
Kwanyenum ukwu ma kwunyekwa nu mu n'azu, ka anyi mezie ala Okigwe.
Ekwenyerem na anyi were otu obi, ihe ga adiriri anyi nma.
Bianyerenu Adaora Onyechere!
Bianyerenu Action Alliance (AA)!!
Bianyenu aka na oghere nke mbu n'akwukwo mbianye aka!!!
Dika anyi n'eme nkea, asim Chukwu Okike Abiama gbaa anyi ume, nye anyi akö na uche zuru oke, ka anyi hoputa onye kacha nma bukwani Adaora Onyechere; onye ga anochite anya anyi n'ulo nzuko ome iwu na Imo State n'afo 2019.
Chim gozie onye obula!
Abum ezigbo nwa afö,
ADAORA NKEIRU ONYECHERE
Onye AA hoputara maka; Nnochi Anya Okigwe n'ulo nzuko ome iwu na Imo State, 2019
AA CANDIDATE FOR IMO HOUSE OF ASSEMBLY - OKIGWE CONSTITUENCY - 2019)